KWENU! Our culture, our future

 

Maka Uduoyi*

 

Üfüfü...

Üfüfü di iche iche:

Üfüfü...

Üfüfü di iche iche:

E nwere üfüfü ncha

Nwekwaa üfüfü mmiri,

Ma tinyekwara üfüfü mmanya;

Na agünyeghi üfüfü na-agbö

Ma a nyüköö mamïrï önü.

Ihe a niile gosiri na

Üfüfü anaghï agbö onwe ya;

Na ihe gbörö üfüfü,

Na-enweriri ihe butere ya.

Nke a ka m jiri too.

Mana gïnï ka a ga-akpö ya,

Ma igwe bido gböwa üfüfü?

Na mbü, m kpörö ya üfüfü igwe.

Mana oyi ya na üfüfü a so

Mere ka m kpöö ya "üfüfü oyi."

~ chinedu ~

 

 

....Ibube

Anwürü nke ökü esoghi, o dïghï;

Ede anaghï ebe ‘nwïï’ n’efu;

Awö anaghï agba ösö efu.

Oshimmiri, ö na-eri ükwü ö hüghï?

Ya ka e ji-ajü ndi ma maka uduoyi:

Ö’ü gïnï na-ebute "üfüfü oyï"?

Ö’ü naanï mmiri oyi na-agbö üfüfü,

Ka o nwere ncha na-agbö ya üfüfü?

Ee, üfüfü anaghï agbö onwe ya;

Oyi n’onwe ya anaghi agbö üfüfü.

Ka ö’ü na ihe ahü abüghï üfüfü,

Maka na üfüfü anaghï afü onwe ya?

A ma na mmiri anaghï agbö üfüfü—

Ihe dï na mmiri na-agbö üfüfü.

O nweghi ihe dï n’ime üfüfü uduoyi:

Uduoyi na-ebute "ibubeoyi."

~ ögöchukwu ~

 

 

* Uduoyi means "Winter." These two poems present options for an Igbo word meaning "snow." Any one of these two terms could aptly define snow: 

üfüfü oyi (cold foam/froth, but snow flakes do not foam on their own) or 

ibubeoyi (cold flakes = snow).

What do you think?

 

www.kwenu.com: Simply surprise yourself yonder!