|
KWENU! Our culture, our future |
|
Maka Uduoyi*
Üfüfü... Üfüfü di iche iche: Üfüfü... Üfüfü di iche iche: E nwere üfüfü ncha Nwekwaa üfüfü mmiri, Ma tinyekwara üfüfü mmanya; Na agünyeghi üfüfü na-agbö Ma a nyüköö mamïrï önü. Ihe a niile gosiri na Üfüfü anaghï agbö onwe ya; Na ihe gbörö üfüfü, Na-enweriri ihe butere ya. Nke a ka m jiri too. Mana gïnï ka a ga-akpö ya, Ma igwe bido gböwa üfüfü? Na mbü, m kpörö ya üfüfü igwe. Mana oyi ya na üfüfü a so Mere ka m kpöö ya "üfüfü oyi." ~ chinedu ~
....Ibube Anwürü nke ökü esoghi, o dïghï; Ede anaghï ebe ‘nwïï’ n’efu; Awö anaghï agba ösö efu. Oshimmiri, ö na-eri ükwü ö hüghï? Ya ka e ji-ajü ndi ma maka uduoyi: Ö’ü gïnï na-ebute "üfüfü oyï"? Ö’ü naanï mmiri oyi na-agbö üfüfü, Ka o nwere ncha na-agbö ya üfüfü? Ee, üfüfü anaghï agbö onwe ya; Oyi n’onwe ya anaghi agbö üfüfü. Ka ö’ü na ihe ahü abüghï üfüfü, Maka na üfüfü anaghï afü onwe ya? A ma na mmiri anaghï agbö üfüfü— Ihe dï na mmiri na-agbö üfüfü. O nweghi ihe dï n’ime üfüfü uduoyi: Uduoyi na-ebute "ibubeoyi." ~ ögöchukwu ~
* Uduoyi means "Winter." These two poems present options for an Igbo word meaning "snow." Any one of these two terms could aptly define snow: üfüfü oyi (cold foam/froth, but snow flakes do not foam on their own) or ibubeoyi (cold flakes = snow). What do you think? |
|
www.kwenu.com: Simply surprise yourself yonder! |